Omekaome

Di ka mmekorita udele na okuko
otu a ka mmadu na ochichi di
na-etikwasi mgbe niile
na-atagbukwa dika ndi otu nzuzo
ka okwa ogu n’agha, ha ejikerela
ka-adogasia aku obodo.

Orukwe mgbe ahu
ndi okenye kwuru na-anaghi
agwa ochi nti na agha esula
ha akadola ogodo ha
ma piakwa onu ha
ha ewerela nkwa kwepu nti
ndi anuchiela nti.
nkwa ha na-ekwe di ka
mmiri awunyere n’opio
osite ebe a banye, osite ebe a gbapu.

Uwa na-akwasi akwa
olu akwa ndi mmadu echiela
ogene na udu-
akwa ariri ka o bu.
ndi si na o bu ha nwe obodo
aturula aka, foro ntutu taa
ma tasikwa obi ike
were aka runye ndi mmadu n’anya.

Nkwa ha aburula ihe onu
anughi ako. Anyi ewerela
ihe chufuo ewu oji
weresie abali chowa ya.

Oha obodo ka anyi lakpuo
maka na chi ewerela otutu
jie, ka anyi cheba mgbe chi
ga-efo, mgbe ihe ga eweta mmepe obodo
ka chi fuo…

E. C. Sylvester
© 2013